Aịzaya 65:12
Isaiah 65:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”
Isaiah 65:12 in English
Isaiah 65:12 · Berean Standard Bible
I will destine you for the sword, and you will all kneel down to be slaughtered, because I called and you did not answer, I spoke and you did not listen; you did evil in My sight and chose that in which I did not delight.”
Context
10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;
Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,
na ndị m na-achọsi m ike. 11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,
ndị chezọrọ ugwu nsọ m,
ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,
ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.* 12Aga m eme ka unu zute mma agha;
unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.
Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;
mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.
Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” 13Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“Ndị ohu m ga-eriju afọ,
ma unu ga-anọ agụụ,
akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,
ma ha ga-aṅụ mmiri.
Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,
ma ha ga-anọ nʼọṅụ. 14Ndị ohu m ga-abụ abụ
nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,
ma unu ga-akwa akwa,
nʼihi ihe mgbu nke obi unu,
tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.