Aịzaya 61:7
Isaiah 61:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.
Isaiah 61:7 in English
Isaiah 61:7 · Berean Standard Bible
Instead of shame, My people will have a double portion, and instead of humiliation, they will rejoice in their share; and so they will inherit a double portion in their land, and everlasting joy will be theirs.
Context
5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu;
ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile. 6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị,
kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị.
A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu.
Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a,
ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ,
nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara.
Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ,
ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya.
Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị.
Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara,
mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama,
a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile.
Ndị niile hụrụ ha ga-amata,
kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.