Aịzaya 61:9
Isaiah 61:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
Isaiah 61:9 in English
Isaiah 61:9 · Berean Standard Bible
Their descendants will be known among the nations, and their offspring among the peoples. All who see them will acknowledge that they are a people the LORD has blessed.
Context
7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a,
ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ,
nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara.
Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ,
ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya.
Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị.
Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara,
mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama,
a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile.
Ndị niile hụrụ ha ga-amata,
kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.” 10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,
mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.
Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,
werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.
Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja.
E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta,
dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto
pupụta nʼihu mba niile.
61:1 Imeghe anya ndị kpuru ìsì
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.