Aịzaya 61:10
Isaiah 61:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
Isaiah 61:10 in English
Isaiah 61:10 · Berean Standard Bible
I will rejoice greatly in the LORD, my soul will exult in my God; for He has clothed me with garments of salvation and wrapped me in a robe of righteousness, as a bridegroom wears a priestly headdress, as a bride adorns herself with her jewels.
Context
8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya.
Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị.
Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara,
mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama,
a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile.
Ndị niile hụrụ ha ga-amata,
kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.” 10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,
mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.
Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,
werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.
Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja.
E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta,
dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto
pupụta nʼihu mba niile.
61:1 Imeghe anya ndị kpuru ìsì
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.