Aịzaya 61:8
Isaiah 61:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.
Isaiah 61:8 in English
Isaiah 61:8 · Berean Standard Bible
For I, the LORD, love justice; I hate robbery and iniquity; in My faithfulness I will give them their recompense and make an everlasting covenant with them.
Context
6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị,
kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị.
A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu.
Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a,
ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ,
nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara.
Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ,
ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya.
Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị.
Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara,
mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama,
a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile.
Ndị niile hụrụ ha ga-amata,
kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.” 10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,
mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.
Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,
werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.
Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja.
E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.