Native Bible

Isaiah 61:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi.

Isaiah 61:6 in English

Isaiah 61:6 · Berean Standard Bible

But you will be called the priests of the LORD; they will speak of you as ministers of our God; you will feed on the wealth of nations, and you will boast in their riches.

Context

4Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie, doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya; ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ, bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga. 5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile. 6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.