Aịzaya 61:5
Isaiah 61:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile.
Isaiah 61:5 in English
Isaiah 61:5 · Berean Standard Bible
Strangers will stand and feed your flocks, and foreigners will be your plowmen and vinedressers.
Context
3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.
O zitere m inye ha okpueze mara mma
nʼọnọdụ ntụ,
inye ha ọṅụ,
nʼọnọdụ ịkwa akwa,
na iyikwasị ha mmụọ otuto
nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.
Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,
dịka osisi ook siri ike,
igosi ịma mma Onyenwe anyị. 4Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie,
doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya;
ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ,
bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga. 5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu;
ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile. 6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị,
kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị.
A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu.
Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a,
ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ,
nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara.
Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ,
ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.