Aịzaya 59:8
Isaiah 59:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.
Isaiah 59:8 in English
Isaiah 59:8 · Berean Standard Bible
The way of peace they have not known,* and there is no justice in their tracks. They have turned them into crooked paths; no one who treads on them will know peace.
Context
6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,
ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.
Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,
omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. 7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. 8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. 9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,
ezi omume adịghị erute anyị nso.
Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị. 10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya,
na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya;
anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji,
nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.