Aịzaya 59:9
Isaiah 59:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
Isaiah 59:9 in English
Isaiah 59:9 · Berean Standard Bible
Therefore justice is far from us, and righteousness does not reach us. We hope for light, but there is darkness; for brightness, but we walk in gloom.
Context
7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. 8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. 9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,
ezi omume adịghị erute anyị nso.
Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị. 10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya,
na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya;
anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji,
nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ. 11Anyị na-agbọ ụja dịka bịa;
anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ.
Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka;
anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.