Aịzaya 59:10
Isaiah 59:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
Isaiah 59:10 in English
Isaiah 59:10 · Berean Standard Bible
Like the blind, we feel our way along the wall, groping like those without eyes. We stumble at midday as in the twilight; among the vigorous we are like the dead.
Context
8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. 9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,
ezi omume adịghị erute anyị nso.
Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị. 10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya,
na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya;
anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji,
nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ. 11Anyị na-agbọ ụja dịka bịa;
anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ.
Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka;
anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ. 12Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị;
ọ na-agbakwa ama megide anyị.
E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ,
nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.