Aịzaya 59:7
Isaiah 59:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
Isaiah 59:7 in English
Isaiah 59:7 · Berean Standard Bible
Their feet run to evil; they are swift to shed innocent blood. Their thoughts are sinful thoughts; ruin and destruction * lie in their wake.
Context
5Ha na-avụ akwa ajụala,
na-akpakwa akwụ udide.
Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,
mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta. 6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,
ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.
Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,
omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. 7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. 8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. 9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,
ezi omume adịghị erute anyị nso.
Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.