Aịzaya 59:5
Isaiah 59:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
Isaiah 59:5 in English
Isaiah 59:5 · Berean Standard Bible
They hatch the eggs of vipers and weave a spider’s web. Whoever eats their eggs will die; crack one open, and a viper is hatched.
Context
3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara,
mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ.
Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha,
ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ. 4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe.
Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha,
ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe. 5Ha na-avụ akwa ajụala,
na-akpakwa akwụ udide.
Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,
mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta. 6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,
ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.
Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,
omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. 7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.