Aịzaya 59:6
Isaiah 59:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
Isaiah 59:6 in English
Isaiah 59:6 · Berean Standard Bible
Their cobwebs cannot be made into clothing, and they cannot cover themselves with their works. Their deeds are sinful deeds, and acts of violence are in their hands.
Context
4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe.
Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha,
ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe. 5Ha na-avụ akwa ajụala,
na-akpakwa akwụ udide.
Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,
mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta. 6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,
ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.
Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,
omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. 7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. 8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.