Aịzaya 59:3
Isaiah 59:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
Isaiah 59:3 in English
Isaiah 59:3 · Berean Standard Bible
For your hands are stained with blood, and your fingers with iniquity; your lips have spoken lies, and your tongue mutters injustice.
Context
1Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta,
ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe. 2Kama mmehie unu ekewapụla unu
site nʼebe Chineke unu nọ;
mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ,
nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ. 3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara,
mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ.
Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha,
ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ. 4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe.
Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha,
ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe. 5Ha na-avụ akwa ajụala,
na-akpakwa akwụ udide.
Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,
mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.