Aịzaya 59:1
Isaiah 59:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
Isaiah 59:1 in English
Isaiah 59:1 · Berean Standard Bible
Surely the arm of the LORD is not too short to save, nor His ear too dull to hear.
Context
1Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta,
ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe. 2Kama mmehie unu ekewapụla unu
site nʼebe Chineke unu nọ;
mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ,
nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ. 3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara,
mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ.
Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha,
ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.