Aịzaya 57:3
Isaiah 57:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
Isaiah 57:3 in English
Isaiah 57:3 · Berean Standard Bible
“But come here, you sons of a sorceress, you offspring of adulterers and prostitutes!
Context
1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,
ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;
a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,
ma ọ dịghị onye na-aghọta,
na-ewezugara onye ezi omume
pụọ nʼihu ihe ọjọọ. 2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
na-abanye nʼudo.
Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ. 3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna. 4Onye ka unu na-akwa emo?
Onye ka unu na-akọcha,
na-arapụtakwara ire unu?
Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,
mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha? 5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.
Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja
na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.