Aịzaya 57:5
Isaiah 57:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
Isaiah 57:5 in English
Isaiah 57:5 · Berean Standard Bible
who burn with lust among the oaks, under every luxuriant tree, who slaughter your children in the valleys, under the clefts of the rocks?
Context
3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna. 4Onye ka unu na-akwa emo?
Onye ka unu na-akọcha,
na-arapụtakwara ire unu?
Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,
mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha? 5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.
Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja
na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu. 6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,*
nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.
E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile
na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.
Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu? 7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.