Aịzaya 57:7
Isaiah 57:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
Isaiah 57:7 in English
Isaiah 57:7 · Berean Standard Bible
On a high and lofty hill you have made your bed, and there you went up to offer sacrifices.
Context
5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.
Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja
na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu. 6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,*
nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.
E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile
na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.
Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu? 7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu. 8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.
Ị gbakụtara m azụ,
yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,
ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,
imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ. 9Ị were mmanụ jekwuru Molek*
meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.
Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị* gaa na mba dị anya;
ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.