Aịzaya 57:9
Isaiah 57:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị were mmanụ jekwuru Molek* meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị* gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
Isaiah 57:9 in English
Isaiah 57:9 · Berean Standard Bible
You went to Molech * with oil and multiplied your perfumes. You have sent your envoys * a great distance; you have descended even to Sheol itself.
Context
7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu. 8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.
Ị gbakụtara m azụ,
yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,
ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,
imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ. 9Ị were mmanụ jekwuru Molek*
meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.
Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị* gaa na mba dị anya;
ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. 10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’
Ị chọtara ntute nye ndụ gị,
ya mere, na ị daghị mba. 11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?
Ị naghị echetakwa m,
ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?
Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile
ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.