Native Bible

Isaiah 57:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.

Isaiah 57:8 in English

Isaiah 57:8 · Berean Standard Bible

Behind the door and doorpost you have set up your memorial. Forsaking Me, you uncovered your bed; you climbed up and opened it wide. And you have made a pact with those whose bed you have loved; you have gazed upon their nakedness.

Context

6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,* nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu? 7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu. 8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ. 9Ị were mmanụ jekwuru Molek* meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị* gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. 10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.