Aịzaya 57:10
Isaiah 57:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
Isaiah 57:10 in English
Isaiah 57:10 · Berean Standard Bible
You are wearied by your many journeys, but you did not say, “There is no hope!” You found renewal of your strength; therefore you did not grow weak.
Context
8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.
Ị gbakụtara m azụ,
yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,
ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,
imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ. 9Ị were mmanụ jekwuru Molek*
meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.
Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị* gaa na mba dị anya;
ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. 10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’
Ị chọtara ntute nye ndụ gị,
ya mere, na ị daghị mba. 11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?
Ị naghị echetakwa m,
ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?
Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile
ka i ji hapụ ịtụ m egwu? 12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.