Aịzaya 57:12
Isaiah 57:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
Isaiah 57:12 in English
Isaiah 57:12 · Berean Standard Bible
I will expose your righteousness and your works, and they will not profit you.
Context
10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’
Ị chọtara ntute nye ndụ gị,
ya mere, na ị daghị mba. 11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?
Ị naghị echetakwa m,
ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?
Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile
ka i ji hapụ ịtụ m egwu? 12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka. 13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,
ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.
Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,
naanị otu nkuume ga-ekutu ha.
Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ
ga-eketa ala ahụ;
ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.” 14A ga-asịkwa,
“Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.
Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.