Native Bible

Isaiah 57:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”

Isaiah 57:14 in English

Isaiah 57:14 · Berean Standard Bible

And it will be said, “Build it up, build it up, prepare the way, take every obstacle out of the way of My people.”

Context

12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka. 13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.” 14A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.” 15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi. 16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.