Aịzaya 57:14
Isaiah 57:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
Isaiah 57:14 in English
Isaiah 57:14 · Berean Standard Bible
And it will be said, “Build it up, build it up, prepare the way, take every obstacle out of the way of My people.”
Context
12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka. 13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,
ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.
Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,
naanị otu nkuume ga-ekutu ha.
Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ
ga-eketa ala ahụ;
ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.” 14A ga-asịkwa,
“Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.
Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.” 15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,
onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:
“Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,
ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,
itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,
na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi. 16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,
maọbụ na-egosi iwe m.
Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,
ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.