Native Bible

Isaiah 57:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

Isaiah 57:15 in English

Isaiah 57:15 · Berean Standard Bible

For thus says the One who is high and lifted up, who inhabits eternity, whose name is Holy: “I dwell in a high and holy place, and with the oppressed and humble in spirit, to restore the spirit of the lowly and revive the heart of the contrite.

Context

13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.” 14A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.” 15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi. 16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ. 17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.