Aịzaya 57:17
Isaiah 57:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
Isaiah 57:17 in English
Isaiah 57:17 · Berean Standard Bible
I was enraged by his sinful greed, so I struck him and hid My face in anger; yet he kept turning back to the desires of his heart.
Context
15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,
onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:
“Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,
ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,
itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,
na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi. 16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,
maọbụ na-egosi iwe m.
Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,
ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ. 17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.
Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.
Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ. 18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.
Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi. 19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.
Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,”
ka Onyenwe anyị kwuru.
“Aga m agwọkwa ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.