Aịzaya 57:19
Isaiah 57:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
Isaiah 57:19 in English
Isaiah 57:19 · Berean Standard Bible
bringing praise to their lips. Peace, peace to those far and near,” says the LORD, “and I will heal them.”
Context
17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.
Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.
Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ. 18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.
Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi. 19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.
Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,”
ka Onyenwe anyị kwuru.
“Aga m agwọkwa ha.” 20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,
nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla.
Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị. 21“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
57:6 Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi.
57:9 Maọbụ, eze
57:9 Ya bụ, arụsị apịrị apị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.