Native Bible

Isaiah 57:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.

Isaiah 57:20 in English

Isaiah 57:20 · Berean Standard Bible

But the wicked are like the storm-tossed sea, for it cannot be still, and its waves churn up mire and muck.

Context

18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi. 19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.” 20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị. 21“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru. 57:6 Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi. 57:9 Maọbụ, eze 57:9 Ya bụ, arụsị apịrị apị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.