Native Bible

Isaiah 57:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.

Isaiah 57:2 in English

Isaiah 57:2 · Berean Standard Bible

Those who walk uprightly enter into peace; they find rest, lying down in death.

Context

1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ. 2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ. 3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna. 4Onye ka unu na-akwa emo? Onye ka unu na-akọcha, na-arapụtakwara ire unu? Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi, mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.