Aịzaya 57:1
Isaiah 57:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
Isaiah 57:1 in English
Isaiah 57:1 · Berean Standard Bible
The righteous perish, and no one takes it to heart; devout men are swept away, while no one considers that the righteous are guided from the presence of evil.
Context
1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,
ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;
a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,
ma ọ dịghị onye na-aghọta,
na-ewezugara onye ezi omume
pụọ nʼihu ihe ọjọọ. 2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
na-abanye nʼudo.
Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ. 3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.