Aịzaya 51:19
Isaiah 51:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?
Isaiah 51:19 in English
Isaiah 51:19 · Berean Standard Bible
These pairs have befallen you: devastation and destruction, famine and sword. Who will grieve for you? Who can comfort you?*
Context
17Teta, teta,
bilie gị Jerusalem,
gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị,
bụ iko nke oke iwe ya.
Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ
nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. 18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,
nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,
maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ
o kwesiri ịgbaso. 19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.
Onye ga-akasị gị obi?
Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,
onye ga-akasị gị obi? 20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.
Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,
dịka mgbada ọnya mara.
Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị
na ịba mba nke Chineke gị. 21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,
ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.