Aịzaya 51:21
Isaiah 51:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
Isaiah 51:21 in English
Isaiah 51:21 · Berean Standard Bible
Therefore now hear this, you afflicted one, drunken, but not with wine.
Context
19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.
Onye ga-akasị gị obi?
Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,
onye ga-akasị gị obi? 20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.
Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,
dịka mgbada ọnya mara.
Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị
na ịba mba nke Chineke gị. 21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,
ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya. 22Lee ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi.
“Lee, aga m esite nʼaka gị
wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa,
ị gaghị aṅụkwa
site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ. 23Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị,
bụ ndị sịrị gị,
‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’
I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ
ebe ndị mmadụ si aga ije.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.