Aịzaya 51:20
Isaiah 51:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
Isaiah 51:20 in English
Isaiah 51:20 · Berean Standard Bible
Your sons have fainted; they lie at the head of every street, like an antelope in a net. They are full of the wrath of the LORD, the rebuke of your God.
Context
18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,
nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,
maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ
o kwesiri ịgbaso. 19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.
Onye ga-akasị gị obi?
Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,
onye ga-akasị gị obi? 20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.
Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,
dịka mgbada ọnya mara.
Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị
na ịba mba nke Chineke gị. 21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,
ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya. 22Lee ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi.
“Lee, aga m esite nʼaka gị
wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa,
ị gaghị aṅụkwa
site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.