Aịzaya 51:18
Isaiah 51:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.
Isaiah 51:18 in English
Isaiah 51:18 · Berean Standard Bible
Among all the sons she bore, there is no one to guide her; among all the sons she brought up, there is no one to take her hand.
Context
16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,
chebekwa gị nʼọbụaka m.
Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,
dokwaa ntọala nke ụwa.
Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” 17Teta, teta,
bilie gị Jerusalem,
gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị,
bụ iko nke oke iwe ya.
Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ
nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. 18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,
nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,
maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ
o kwesiri ịgbaso. 19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.
Onye ga-akasị gị obi?
Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,
onye ga-akasị gị obi? 20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.
Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,
dịka mgbada ọnya mara.
Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị
na ịba mba nke Chineke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.