Aịzaya 51:16
Isaiah 51:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”
Isaiah 51:16 in English
Isaiah 51:16 · Berean Standard Bible
I have put My words in your mouth, and covered you with the shadow of My hand, to establish * the heavens, to found the earth, and to say to Zion, ‘You are My people.’”
Context
14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha. 15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,
chebekwa gị nʼọbụaka m.
Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,
dokwaa ntọala nke ụwa.
Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” 17Teta, teta,
bilie gị Jerusalem,
gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị,
bụ iko nke oke iwe ya.
Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ
nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. 18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,
nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,
maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ
o kwesiri ịgbaso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.