Native Bible

Isaiah 51:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”

Isaiah 51:16 in English

Isaiah 51:16 · Berean Standard Bible

I have put My words in your mouth, and covered you with the shadow of My hand, to establish * the heavens, to found the earth, and to say to Zion, ‘You are My people.’”

Context

14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha. 15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” 17Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. 18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.