Aịzaya 51:14
Isaiah 51:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha.
Isaiah 51:14 in English
Isaiah 51:14 · Berean Standard Bible
The captive will soon be freed; he will not die in the dungeon, and his bread will not be lacking.
Context
12“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi.
Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ,
ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, 13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu,
onye na-esetipụ eluigwe,
onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;
na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile
nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,
onye nke kpebiri ibibi unu?
Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? 14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha. 15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,
chebekwa gị nʼọbụaka m.
Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,
dokwaa ntọala nke ụwa.
Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.