Aịzaya 51:13
Isaiah 51:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
Isaiah 51:13 in English
Isaiah 51:13 · Berean Standard Bible
But you have forgotten the LORD, your Maker, who stretched out the heavens and laid the foundations of the earth. You live in terror all day long because of the fury of the oppressor who is bent on destruction. But where is the fury of the oppressor?
Context
11Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha,
oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha,
iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga. 12“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi.
Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ,
ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, 13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu,
onye na-esetipụ eluigwe,
onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;
na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile
nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,
onye nke kpebiri ibibi unu?
Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? 14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha. 15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.