Aịzaya 51:15
Isaiah 51:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Isaiah 51:15 in English
Isaiah 51:15 · Berean Standard Bible
For I am the LORD your God who stirs up the sea so that its waves roar— the LORD of Hosts is His name.
Context
13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu,
onye na-esetipụ eluigwe,
onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;
na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile
nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,
onye nke kpebiri ibibi unu?
Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? 14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha. 15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,
chebekwa gị nʼọbụaka m.
Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,
dokwaa ntọala nke ụwa.
Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” 17Teta, teta,
bilie gị Jerusalem,
gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị,
bụ iko nke oke iwe ya.
Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ
nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.