Aịzaya 51:12
Isaiah 51:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
Isaiah 51:12 in English
Isaiah 51:12 · Berean Standard Bible
“I, even I, am He who comforts you. Why should you be afraid of mortal man, of a son of man who withers like grass?
Context
10Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa?
Mmiri ahụ dị omimi.
Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya,
ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee? 11Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha,
oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha,
iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga. 12“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi.
Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ,
ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, 13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu,
onye na-esetipụ eluigwe,
onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;
na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile
nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,
onye nke kpebiri ibibi unu?
Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? 14Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.