Native Bible

Isaiah 51:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

Isaiah 51:11 in English

Isaiah 51:11 · Berean Standard Bible

So the redeemed of the LORD will return and enter Zion with singing, crowned with everlasting joy. Gladness and joy will overtake them, and sorrow and sighing will flee.

Context

9Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ? 10Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee? 11Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga. 12“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, 13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.