Aịzaya 51:9
Isaiah 51:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
Isaiah 51:9 in English
Isaiah 51:9 · Berean Standard Bible
Awake, awake, put on strength, O arm of the LORD. Wake up as in days past, as in generations of old. Was it not You who cut Rahab to pieces, who pierced through the dragon?
Context
7Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma,
unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu.
Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu,
unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu. 8Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa.
Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ.
Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 9Teta, teta, yikwasị onwe gị ike,
gị aka Onyenwe anyị,
bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga,
dịka ọgbọ nke mgbe ochie.
Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab
ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ? 10Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa?
Mmiri ahụ dị omimi.
Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya,
ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee? 11Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha,
oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha,
iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.