Aịzaya 51:23
Isaiah 51:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”
Isaiah 51:23 in English
Isaiah 51:23 · Berean Standard Bible
I will place it in the hands of your tormentors, who told you: ‘Lie down, so we can walk over you,’ so that you made your back like the ground, like a street to be traversed.”
Context
21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,
ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya. 22Lee ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi.
“Lee, aga m esite nʼaka gị
wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa,
ị gaghị aṅụkwa
site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ. 23Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị,
bụ ndị sịrị gị,
‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’
I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ
ebe ndị mmadụ si aga ije.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.