Aịzaya 5:14
Isaiah 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.
Isaiah 5:14 in English
Isaiah 5:14 · Berean Standard Bible
Therefore Sheol enlarges its throat and opens wide its enormous jaws, and down go Zion’s nobles and masses, her revelers and carousers!
Context
12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
nʼihi amaghị ihe;
ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,
ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;
ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,
tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
na ndị dị ala,
ndị mpako ka a ga-eweda nʼala. 16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.