Native Bible

Isaiah 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.

Isaiah 5:12 in English

Isaiah 5:12 · Berean Standard Bible

At their feasts are the lyre and harp, tambourines and flutes and wine. They disregard the actions of the LORD and fail to see the work of His hands.

Context

10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.” 11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.