Aịzaya 5:10
Isaiah 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
Isaiah 5:10 in English
Isaiah 5:10 · Berean Standard Bible
For ten acres of vineyard will yield but a bath of wine,* and a homer of seed only an ephah of grain.*”
Context
8Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala
ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi,
unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu,
ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa. 9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,
“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,
ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa. 10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.” 11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
ịgbaso mmanya.
Ndị na-amụgide anya abalị
tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.