Aịzaya 5:8
Isaiah 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
Isaiah 5:8 in English
Isaiah 5:8 · Berean Standard Bible
Woe to you who add house to house and join field to field until no place is left and you live alone in the land.
Context
6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.
Agakwaghị m egwuru ya ala,
aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya.
Aga m enyekwa igwe ojii iwu
ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.” 7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ mba Izrel
na ndị Juda,
ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ.
Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara.
O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu. 8Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala
ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi,
unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu,
ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa. 9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,
“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,
ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa. 10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.