Aịzaya 5:11
Isaiah 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
Isaiah 5:11 in English
Isaiah 5:11 · Berean Standard Bible
Woe to those who rise early in the morning in pursuit of strong drink, who linger into the evening, to be inflamed by wine.
Context
9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,
“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,
ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa. 10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.” 11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
ịgbaso mmanya.
Ndị na-amụgide anya abalị
tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
nʼihi amaghị ihe;
ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,
ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.