Aịzaya 5:13
Isaiah 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
Isaiah 5:13 in English
Isaiah 5:13 · Berean Standard Bible
Therefore My people will go into exile for their lack of understanding; their dignitaries are starving and their masses are parched with thirst.
Context
11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
ịgbaso mmanya.
Ndị na-amụgide anya abalị
tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
nʼihi amaghị ihe;
ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,
ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;
ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,
tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
na ndị dị ala,
ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.