Native Bible

Isaiah 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.

Isaiah 5:15 in English

Isaiah 5:15 · Berean Standard Bible

So mankind will be brought low, and each man humbled; the arrogant will lower their eyes.

Context

13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala. 16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya. 17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.