Aịzaya 5:16
Isaiah 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
Isaiah 5:16 in English
Isaiah 5:16 · Berean Standard Bible
But the LORD of Hosts will be exalted by His justice, and the holy God will show Himself holy in righteousness.
Context
14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;
ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,
tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
na ndị dị ala,
ndị mpako ka a ga-eweda nʼala. 16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya. 17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,
ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ. 18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;
ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.