Aịzaya 5:18
Isaiah 5:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
Isaiah 5:18 in English
Isaiah 5:18 · Berean Standard Bible
Woe to those who draw iniquity with cords of deceit and pull sin along with cart ropes,
Context
16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya. 17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,
ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ. 18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;
ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala. 19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;
ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ,
ka anyị hụ ya.
Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel,
ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè,
ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.*” 20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,
ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè
na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị
ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,
na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.